1 Ma ob͕ub͕u-ya di Sọl ezi nma.Oké nsob͕u we puta n'ubọchi ahu megide nzukọ Kraist di na Jerusalem; ha nile we b͕asasia n'ala Judia na Sameria dum, ma-ọbughi ndi-ozi.
2 Ndikom ufọdu ndi nātu egwu Chineke we lìe Stifen, kwa-kwa-ra ya oké ákwá.
3 Ma Sọl nēsob͕u nzukọ Kraist nke-uku, nābà n'ulo nile n'otù n'otù, ọ nādọkpu kwa ndikom na ndinyom we rara ha nye ka atubà ha n'ulo-nkpọrọ.
4 Ya mere ndi b͕asara jeghariri nēzisa ozi ọma, bú okwu Chineke.
5 Filip we rida n'obodo Sameria, kwusara ha Kraist-ayi.
6 Ìgwè madu nile we were otù obi nāṅa nti ihe nile Filip nēkwu, mb͕e ha nuru, hu kwa ihe-iriba-ama ọ nēme.
7 N'ihi na site n'aru ọtutu ndi nwere ndi-mọ nādighi ọcha ka mọ ahu putara, nēwere oké olu ti nkpu: eme-kwa-ra ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi akuku-aru-ha nwuru anwu, na ndi dara ngwurọ.