30 Filip we b͕akuru ya, we nu ya ka ọ nāgu akwukwọ Aisaia onye-amuma, o we si, Ì nāmata ihe i nāgu?
31 Ọ si, É-è, n'ihi na #m'gēsi aṅa pu imata, ma ọ buru na ọ dighi onye gēdum? O we riọ Filip ka ọ rigota, ka ya na ya nọdu.
32 Ma ibe ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke ọ nāgu bu nka,Esekpuru Ya, dika aturu, je ob͕ub͕u;Dika nwa-aturu da-kwa-ra ob͕i n'iru onye nākpacha ya aji,Otú a ka Ọ nādighi-asaghe ọnu-Ya:
33 Ewepuru ikpé-Ya nime ọnọdu-Ya di ala:Ònye gākọ ọb͕ọ Ya?N'ihi na anēwepu ndu-Ya n'uwa.
34 Onozi ahu we za Filip, si, Ariọm i, ònye ka onye-amuma nka nēkwu okwu a bayere? ọ̀ bu ya onwe-ya ma-ọbu onye ọzọ di iche?
35 Filip we saghe ọnu-ya, zì ya ozi ọma Jisus, nāmalite site n'ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ.
36 Ma mb͕e ha nāga n'uzọ, ha biaruru otù miri; onozi ahu we si, Le, miri; gini nānapu imem baptism?