1 Ma Sọl, ebe ọ nēwere iba-nba na ob͕ub͕u ku ume megide ndi nēso uzọ Onye-nwe-ayi rue ub͕u a, o jekuru onye-isi-nchu-àjà,
2 riọ akwukwọ-ozi n'aka-ya igaru Damaskọs inye ndi ulo-nzukọ, ka ọ gābu, ma asi na ọ chọtara ndi ọ bula di n'Uzọ a, ma-ọbu ndikom ma-ọbu ndinyom, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u bia Jerusalem.
3 Ma mb͕e ọ nāga, o rue na ọ nābiaru Damaskọs nso: na mberede ìhè si n'elu-igwe b͕uru ya àmùmà buruburu:
4 o we da n'ala, nu otù olu ka ọ nāsi ya, Sọl, Sọl, gini mere i nēsob͕um?
5 O we si, Ì bu Onye, Onye-nwe-ayi? Ọ si Mu onwem bu Jisus, Onye gi onwe-gi nēsob͕u:
6 ma bilie, ba nime obodo, agāgwa gi ihe i nāghaghi ime.