14 n'ebe a ka o nwe-kwa-ra ike site n'ebe ndi-isi-nchu-àjà nọ ike ndi nile nākpọku aha-Gi ab͕u.
15 Ma Onye-nwe-ayi siri ya, Ga: n'ihi na onye ahu bu ihe-ọlu arọputara nyem, ka o buru aham che n'iru mba ọzọ na ndi-eze, na umu Israel:
16 n'ihi na Mu onwem gēgosi ya ka ha ra, bú ahuhu nile ọ nāghaghi ihu n'ihi aham.
17 Ananaias we je, ba n'ulo ahu; o we bikwasi ya aka-ya abua n'isi, si, Sọl, nwa-nnam, Onye-nwe-ayi, bú Jisus, Onye mere ka i hu Ya n'uzọ i si bia, ezitewom, ka ewe me ka i hu uzọ, ka i we juputa kwa na Mọ Nsọ.
18 Ngwa ngwa ihe dika akpirikpa we si n'anya-ya dapu, eme-kwa-ra ka ọ hu uzọ; o we bilie, eme ya baptism;
19 o we nara nri, ewe me ka ọ nwe ume.Ya na ndi nēso uzọ Jisus na Damaskọs we nọ ubọchi ufọdu.
20 Ngwa ngwa n'ulo-nzukọ-ha nile o we nēkwusa Jisus, na Ya onwe-ya bu Ọkpara Chineke.