21 Ibobo we nwua ndi nile nuru ya n'aru, ha nāsi, Ọ̀ bughi onye a bu onye mebiri nime Jerusalem ndi nākpọku aha nka? ọ bia-kwa-rari n'ebe a ime ihe a, bú, ka o we dọkpuru ha n'ab͕u je n'iru ndi-isi-nchu-àjà.
22 Ma emere Sọl ka o nwe kari ike, ọ nēkwu kwa okwu nke b͕ara ndi-Ju bi na Damaskọs ghari, ebe ọ nēgosi nke-ọma na Onye a bu Kraist-ha.
23 Ma mb͕e ọtutu ubọchi zuru, ndi-Ju b͕ara ìzù ib͕u ya:
24 ma emere ka Sọl mara ajọ ìzù-ha. Ha we nēche kwa ọnu-uzọ-ama nile ehihie na abali ka ha we b͕ue ya:
25 ma ndi nēso uzọ-ya kuru ya n'abali, weda ya n'ala site na mb͕idi nke obodo, nārada ya n'abọ.
26 Ma mb͕e ọ biaruru Jerusalem, ọ nwara iwere onwe-ya rapara n'aru ndi nēso uzọ Jisus: ma ha nile nātu egwu ya, ebe ha nēkweghi na ọ bu onye nēso uzọ Jisus.
27 Ma Banabas jidere ya n'aka, we duru ya jekuru ndi-ozi, kọrọ ha otú ọ hururi Onye-nwe-ayi n'uzọ, kọkwa-ra ha, si, na Ọ gwara ya-ri okwu, ya na otú o kwuwarari okwu na Damaskọs n'aha Jisus.