40 Ndi Israel nile we so ya n'azu rigo, ndi Israel nēb͕u kwa ọ̀jà, nāṅuri kwa oké ọṅù, ala we b͕awa n'olu-ha.
41 Adonaija na ndi nile akpọrọ, bú ndi ya na ha nọ, we nu ya mb͕e ha onwe-ha risiri ihe. Joab we nu olu opì-ike ahu, si, Gini mere olu a nke obodo nāb͕a aghara?
42 Mb͕e ọ nọ nēkwu okwu, le, Jonatan nwa Abaiata, bú onye-nchu-àjà, biara: Adonaija we si, Bata; n'ihi na nwoke bu dìnkpà ka i bu, ọ bu kwa ezi ozi ọma ka i nēzì.
43 Jonatan we za, si Adonaija, N'ezie onye-nwe-ayi, bú eze Devid, emewo Solomon eze:
44 eze we ziga Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, na Benaia nwa Jehoiada, na ndi Keret na ndi Pelet, tiyere ya, ha emewo kwa ka ọ nọkwasi inyinya mule eze nwere:
45 Zedok, bú onye-nchu-àjà, na Netan, bú onye-amuma, etewo kwa ya manu ibu eze na Gaihon: ha esiwo kwa n'ebe ahu rigo nāṅuri ọṅu, obodo we b͕a aghara. Nka bu olu unu nuworo,
46 Ọzọ kwa, Solomon anọkwasiwo n'oche-eze nke ala-eze.