9 n'ihi na otú a ka enyerem iwu n'okwu Jehova, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri, alaghachi-kwa-la n'uzọ i siri je.
10 O we la n'uzọ ọzọ, ọ laghachighi kwa n'uzọ o siri biaru Bet-el.
11 Ma otù onye-amuma, bú agadi, bi na Bet-el; nwa-ya we bia, kọrọ ya akukọ omume nile nke onye nke Chineke mere ubọchi ahu na Bet-el: okwu nile ọ gwara eze, ha we kọrọ nna-ha akukọ okwu ahu.
12 Nna-ha we gwa ha okwu, si, Òle nke bu uzọ o jere? Ma umu-ya ndikom ahuwo uzọ nke onye nke Chineke ahu jere, bú onye siri na Juda bia.
13 O we si umu-ya, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwara ya inyinya-ibu: ọ nọkwasi n'elu ya.
14 O we jeso onye nke Chineke ahu n'azu, chọta ya ka ọ nānọdu n'okpuru osisi terebinth: ọ si ya, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye Chineke ahu nke siri na Juda bia? Ọ si, Ọ bu mu onwem.
15 Ọ si ya, Sorom je n'ulo, ri kwa nri.