1 Na mb͕e ahu Abaija nwa Jeroboam riara ọria.
2 Jeroboam we si nwunye-ya, Biko, bilie, nwogharia onwe-gi, ka aghara imara na gi onwe-gi bu nwunye Jeroboam: i gēje kwa Shailo; le, n'ebe ahu ka Ahaija, bú onye-amuma, nọ; onye ahu kwuru okwu bayerem na m'gābu eze ndi nka.
3 Chiri kwa n'aka-gi ob͕e achicha iri, na achicha ntà, na karama manu-aṅu, jekuru ya: onye ahu gēgosi gi ihe gēme nwa-okoro.
4 Nwunye Jeroboam we me otú a, we bilie, je Shailo, ba n'ulo Ahaija. Ma Ahaija apughi ihu uzọ; n'ihi na anya-ya guzoro eguzo n'ihi agadi-ya.