1 Na mb͕e ahu Abaija nwa Jeroboam riara ọria.
2 Jeroboam we si nwunye-ya, Biko, bilie, nwogharia onwe-gi, ka aghara imara na gi onwe-gi bu nwunye Jeroboam: i gēje kwa Shailo; le, n'ebe ahu ka Ahaija, bú onye-amuma, nọ; onye ahu kwuru okwu bayerem na m'gābu eze ndi nka.
3 Chiri kwa n'aka-gi ob͕e achicha iri, na achicha ntà, na karama manu-aṅu, jekuru ya: onye ahu gēgosi gi ihe gēme nwa-okoro.
4 Nwunye Jeroboam we me otú a, we bilie, je Shailo, ba n'ulo Ahaija. Ma Ahaija apughi ihu uzọ; n'ihi na anya-ya guzoro eguzo n'ihi agadi-ya.
5 Ma Jehova siri Ahaija, Le, nwunye Jeroboam nābia iju ase bayere nwa-ya nwoke n'aka-gi; n'ihi na ọ nāria ọria: otú a na ọtú a ka i gāgwa ya: ọ gēru kwa, mb͕e ọ batara, na nwayi ahu ganēme onwe-ya dika onye ala ọzọ.
6 O rue, mb͕e Ahaija nuru olu ukwu-ya ka ha nāzọ, mb͕e ọ nābata n'ọnu-uzọ, na ọ siri, Bata, nwunye Jeroboam; n'ìhi gini kwa ka gi onwe-gi nēme onwe-gi dika onye ala ọzọ? ma mu onwem bu onye-ozi siri ike n'ebe i nọ.
7 Je, si Jeroboam, Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri: N'ihi na esim n'etiti ndim welie gi elu, me gi onye-ndú ndim, bú Israel,