23 Ma okwu Esa nile nke fọduru, na idi-ike-ya nile, na ihe nile o mere, na obodo nile o wuru, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Nání na ọ riara ọria n'ukwu-ya abua na mb͕e agadi-ya.
24 Esa we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Devid, bú nna-ya: Jehoshafat nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
25 Ma Nedab, bú nwa Jeroboam, malitere ibu eze Israel n'arọ nke-abua nke Esa, bú eze Juda, ọ we buru eze Israel arọ abua.
26 O me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, je ije n'uzọ nna-ya, na nime nmehie-ya nke o ji me ka Israel mehie.
27 Beasha, bú nwa Ahaija, nke ulo Isaka, we kekọta madu imegide ya; Beasha we tib͕ue ya na Gibeton, nke diri ndi Filistia; n'ihi na Nedab na Israel nile nānọchigide Gibeton n'agha.
28 Beasha we me ka ọ nwua n'arọ nke-atọ nke Esa, bú eze Juda, o we buru eze n'ọnọdu ya.
29 O rue, mb͕e ọ malitere ibu eze, na o tib͕uru ulo Jeroboam nile; o kweghi ka onye ọ bula nke nēku ume fọduru Jeroboam, rue mb͕e o kpochapuru ya; dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka orù-Ya, bú Ahaija onye Shailo: