7 Ma okwu Abaijam nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Juda? Ma agha di n'etiti Abaijam na Jeroboam.
8 Abaijam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; ha we lìe ya n'obodo Devid: Esa nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.
9 Ma n'arọ nke-orú nke Jeroboam eze Israel ka Esa malitere ibu eze Juda.
10 Ọgu arọ abua na otù ka ọ bu eze na Jerusalem: aha nne-ya bu Meaka nwa-nwayi Abishalom.
11 Esa mere ihe ziri ezi n'anya Jehova, dika Devid, bú nna-ya, mere.
12 O we me ka ndi edoro nsọ ikwa iko si n'ala-ya gabiga, o wezuga-kwa-ra arusi nile nke nna-ya-hà mere.
13 Ọzọ kwa, Meaka, bú nne-ya, o wezuga-kwa-ra ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, o sure ya ọku na miri-iyi Kidron.