14 Ma okwu Ila nile nke fọduru, na ihe nile o mere, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
15 N'arọ nke-orú-na-asa nke Esa, bú eze Juda, ka Zimri bu eze ubọchi asa na Tiaza. Ma ndi Israel nọ n'ọmuma-ulo-ikwū imegide Gibeton, nke diri ndi Filistia.
16 Ndi nọ n'ọmuma-ulo-ikwū we nu, si, Zimri ekekọtawo madu, ọzọ kwa, o tib͕uwo eze: Israel nile we me Ọmri, bú onye-isi usu-ndi-agha, ka ọ buru eze Israel n'ubọchi ahu n'ọmuma-ulo-ikwū.
17 Ọmri we si na Gibeton rigo, ya na Israel nile, ha we nọchigide Tiaza n'agha.
18 O rue, mb͕e Zimri huru na ewerewo obodo, na ọ bara n'ulo-elu nke ulo eze, sure ulo eze n'ọku n'isi onwe-ya, nwua,
19 n'ihi nmehie-ya nile nke ọ mehiere, n'ime ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, n'ije ije n'uzọ Jeroboam, na nime nmehie nke o mere, ime ka Israel mehie.
20 Ma okwu Zimri nile nke fọduru, na nkekọta nke ọ kekọtara madu imegide eze, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?