3 le, M'nēkpochapu nke fọduru nke Beasha, bú nke fọduru nke ulo-ya; M'gēme kwa ulo-gi ka ọ di ka ulo Jeroboam, bú nwa Nebat.
4 Onye nke Beasha nke nwuru anwu n'obodo, nkita gēri ya; onye nke ya nke nwuru anwu n'ọhia, anu-ufe nke elu-igwe gēri kwa ya.
5 Ma okwu Beasha nile nke fọduru, na ihe o mere, na idi-ike-ya, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke ndi-eze Israel?
6 Beasha we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya na Tiaza; Ila, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.
7 Ọzọ kwa, n'aka Jihu, bú nwa Hanani, onye-amuma, ka okwu Jehova biara imegide Beasha, na imegide ulo-ya, ma n'ihi ihe ọjọ nile nke o mere n'anya Jehova, iwere omume aka-ya kpasue Ya iwe, n'idi ka ulo Jeroboam; ma n'ihi na o tib͕uru ya.
8 N'arọ nke-orú-na-isi nke Esa, bú eze Juda, ka Ila nwa Beasha malitere ibu eze Israel nime Tiaza, arọ abua.
9 Orù-ya Zimri, bú onye-isi nkera ub͕ọ-ala-ya, we kekọta madu imegide ya: ma ya onwe-ya nọ na Tiaza, nāṅu manya nāṅubiga ya okè n'ulo Aza, onye bu onye-isi ulo-ya na Tiaza: