38 Onye-amuma ahu we je, guzoro eze n'uzọ, nwogharia onwe-ya, nātukwasi ákwà-ike-n'isi n'anya-ya abua.
39 O rue, mb͕e eze nāgabiga, na onye ahu tikuru eze nkpu: ọ si, Orù-gi puru ba n'etiti agha; ma, le, otù nwoke wezugara onwe-ya, me ka otù nwoke biakutem, ọ si, Debe nwoke a: ọ buru na ele anya ya ma-ọli ma ahughi ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ma-ọbu na i gākwu talent ọla-ọcha.
40 O rue, mb͕e orù-gi nēme ihe n'otù ebe na ebe ọzọ, na ahughm onye ahu. Eze Israel we si ya, Otú a ka ikpé-gi si di; gi onwe-gi ekwubìwo ya.
41 O we me ngwa, wezuga ákwà-ike-n'isi n'anya-ya abua; eze Israel we mata ya na onye sitere na ndi-amuma ka ọ bu.
42 Ọ si ya, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i zilagawo nwoke ahu ka ọ pua n'aka-gi, bú onye M'wezugara ka ebibie ya, ndu-gi gāla-kwa-ra ndu-ya, ndi-gi gāla-kwa-ra ndi-ya.
43 Eze Israel we la n'ulo-ya n'obi arọ́ na nb͕aru-iru, o we ba na Sameria.