26 Solomon nwe-kwa-ra orú nnù ulo uzọ ise nke inyinya diri ub͕ọ-ala-ya, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri.
27 Ndi ahu edoro ndi-isi zù-kwa-ra eze, bú Solomon, na ndi nile nābiaru table nke eze Solomon nso, nwoke ọ bula n'ọnwa-ya: ha ekweghi ka ihe ọ bula kọ ukọ.
28 Ha nēweta kwa ọka barley na okporo-ọka n'ebe ndi ahu edoro ndi-isi nọ, nwoke ọ bula dika ihe ekpere ya n'ikpe si di, inye inyinya na inye inyinya ukwu ọsọ.
29 Chineke nye-kwa-ra Solomon amam-ihe na nghọta riri nne nke-uku, na obi sara mbara, dika ájá nke di n'usọ oké osimiri.
30 Amam-ihe Solomon we ba uba kari amam-ihe umu Iru-anyanwu nile, kari kwa amam-ihe Ijipt nile.
31 Ọ we mara ihe kari madu nile; kari Itan onye-Ezrahait, na Himan, na Kalkol, na Dada, bú umu-ndikom Mahol: aha-ya we di na mba nile b͕ara ha buruburu.
32 Ọ tua nnù ilu asa na ọgu iri: abù-ya di kwa nnù abua na ọgu iri na abù ise.