14 Solomon we wue ulo ahu, wusia ya.
15 O were ibo osisi cedar wue mb͕idi ulo ahu nime; site n'ala ulo rue mb͕idi nke okpukpu, o were osisi machita ha nime: o were ibo osisi fir machita ala ulo.
16 O were ibo osisi cedar wue ebe di orú cubit n'azu ulo ahu, site n'ala ulo rue mb͕idi: o were ha wuere ya nime, ibu ime-ime-ulo, ibu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.
17 Ulo ahu, nke ahu bú, ulo uku Chineke nke di n'iru ya, di ọgu cubit abua n'ogologo.
18 Osisi cedar di kwa n'aru ulo ahu nime, nke apiri ihe otutu, bú afufa-ọhia na okoko-osisi wara awa: ime ulo ahu nile bu osisi cedar; ọ dighi nkume ahuru anya.
19 O dozi-kwa-ra ime-ime-ulo n'etiti ulo ahu nime, itiye ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova n'ebe ahu.
20 Ma n'iru ime-ime-ulo ahu di orú cubit n'ogologo, na orú cubit n'obosara, na orú cubit n'idi-elu-ya; ọ machita ya ọla-edo makarisiri nma: o were kwa osisi cedar machita ebe-ichu-àjà.