22 Ọ machita-kwa-ra ulo ahu nile ọla-edo, rue mb͕e amachitazuru ulo nile: o were kwa ọla-edo machita ebe-ichu-àjà ahu nile bu nke diri ime-ime-ulo ahu.
23 O me-kwa-ra cherubim abua nke osisi manu olive n'ime-ime-ulo ahu, cubit iri ka elu-ha di.
24 Cubit ise ka otù nku cherub di, cubit ise ka nkù nke-ọzọ nke cherub di kwa: site na nsọtu nkù-ya we rue nsọtu nke-ọzọ nke nkù-ya di cubit iri.
25 Cubit iri ka cherub nke-ọzọ di kwa: cherubim abua ahu nwere otù ọtùtù na otù ọpipi.
26 Idi-elu otù cherub di cubit iri, otú a ka cherub nke-ọzọ di kwa.
27 O we tiye cherubim n'etiti ime-ulo: ha we b͕asa nkù cherubim ahu, nkù nke otù we metu mb͕idi, nkù cherub nke-ọzọ nēmetu kwa mb͕idi nke-ọzọ; nkù-ha nēmeturita onwe-ha, nkù na nkù, n'etiti ulo ahu.
28 Ọ machita cherubim ọla-edo.