18 na Bealat, na Tema n'ọzara, n'ala-ya,
19 na obodo nile nke nchikọbata-ihe nke Solomon nwere, na obodo nile nke ub͕ọ-ala-ya, na obodo nile nke ndi-inyinya-ya, na ihe di Solomon ezi nma n'obi, bú nke di ya ezi nma n'obi iwu na Jerusalem, na nime Lebanon, na n'ala nile ọ nāchi.
20 Ma ndi nile fọduru n'etiti ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n'umu Israel;
21 umu-ha ndi fọduru inọchi ha n'ala, ndi umu Israel nāpughi iwezuga ka ebibie ha, Solomon we si nime ha weputa usu ndi nēfè òfùfè, bú ndi-orù, rue ta.
22 Ma ọ dighi orù Solomon mere site n'umu Israel: kama ndi ahu bu ndikom agha, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ọchi-agha-ya, na ndi-isi ub͕ọ-ala-ya na ndi-inyinya-ya.
23 Ndia bu ndi-isi nke ndi ahu edoro ndi-isi, ndi bu ndi-isi n'ozi anējere Solomon, nnù madu na ọgu asa na iri, ndi nwere ike n'aru ndi nālu ọlu n'ije-ozi ahu.
24 Otú ọ di, nwa-nwayi Fero siri n'obodo Devid rigorue ulo-ya nke Solomon wuru nye ya: mb͕e ahu ka o wuru Milo.