20 Ma ndi nile fọduru n'etiti ndi-Amorait, na ndi Het, na ndi-Perizait, na ndi-Haivait, na ndi Jebus, ndi nēsiteghi n'umu Israel;
21 umu-ha ndi fọduru inọchi ha n'ala, ndi umu Israel nāpughi iwezuga ka ebibie ha, Solomon we si nime ha weputa usu ndi nēfè òfùfè, bú ndi-orù, rue ta.
22 Ma ọ dighi orù Solomon mere site n'umu Israel: kama ndi ahu bu ndikom agha, na ndi-orù-ya, na ndi-isi-ya, na ndi-ọchi-agha-ya, na ndi-isi ub͕ọ-ala-ya na ndi-inyinya-ya.
23 Ndia bu ndi-isi nke ndi ahu edoro ndi-isi, ndi bu ndi-isi n'ozi anējere Solomon, nnù madu na ọgu asa na iri, ndi nwere ike n'aru ndi nālu ọlu n'ije-ozi ahu.
24 Otú ọ di, nwa-nwayi Fero siri n'obodo Devid rigorue ulo-ya nke Solomon wuru nye ya: mb͕e ahu ka o wuru Milo.
25 Ub͕ò atọ n'arọ ka Solomon surere àjà-nsure-ọku na àjà-udo nye Jehova n'elu ebe-ichu-àjà nke o wuru, o we sure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ tiyere ya n'elu ebe-ichu-àjà nke di n'iru Jehova. O we wuzue ulo ahu.
26 Eze, bú Solomon, me-kwa-ra ub͕ọ n'Ezion-geba, nke di n'akuku Ilot, n'usọ Oké Osimiri Uhie, n'ala Edom.