2 Sọl we rọputara onwe-ya nnù ndikom asa na ọgu iri sitere n'Israel; nnù ndikom ise we di n'aka Sọl nime Mikmash na n'ugwu Bet-el, nnù ndikom abua na ọgu iri di kwa n'aka Jonatan nime Gibea Benjamin: ma o zilagara ndi fọduru n'etiti ndi Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya.
3 Jonatan we tib͕ue ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia nke di na Geba, ndi Filistia we nu ya. Sọl we fùa opì-ike n'ala ahu nile, si, Ka ndi-Hibru nu.
4 Israel nile we nu, si, na Sọl tib͕uru ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia, na Israel aghọwo-kwa-ra ndi Filistia ihe nēsì ísì ọjọ. Ewe kpọkọta ndi Israel iso Sọl rue Gilgal.
5 Ndi Filistia we chikọta onwe-ha ibuso Israel agha, orú nnù ub͕ọ-ala uzọ atọ na nnù iri-na-ise, na nnù ndi-inyinya iri-na-ise, na ndi-agha dika ájá nke di n'usọ oké osimiri n'uba: ha we rigota, ma ulo-ikwū-ha na Mikmash, n'akuku Iru-anyanwu Bet-even.
6 Ndikom Israel we hu na nkpà nākpà ha, (n'ihi na anāchi Israel n'ihe-ike), ndi Israel we zo onwe-ha n'ọb͕à, na n'ọhia-ogwu, na nime nkume di elu, na n'ulo-elu, na n'olùlù.
7 Ma ndi-Hibru ufọdu gabigara Jọdan rue ala Gad na Gilead; ma Sọl nọgidere na Gilgal, ndi Israel nile ma-kwa-ra jijiji nēso ya n'azu.
8 O we chere ubọchi asa, dika mb͕e akara àkà si di nke Samuel kara: ma Samuel abiarughi Gilgal; ndi Israel we si n'ebe ọ nọ b͕asa.