7 Ma ndi-Hibru ufọdu gabigara Jọdan rue ala Gad na Gilead; ma Sọl nọgidere na Gilgal, ndi Israel nile ma-kwa-ra jijiji nēso ya n'azu.
8 O we chere ubọchi asa, dika mb͕e akara àkà si di nke Samuel kara: ma Samuel abiarughi Gilgal; ndi Israel we si n'ebe ọ nọ b͕asa.
9 Sọl we si, Wetaram àjà-nsure-ọku ahu na àjà-udo nile nso. O we sure àjà-nsure-ọku ahu.
10 O rue, mb͕e o surebìri àjà-nsure-ọku ahu, le, Samuel biara; Sọl we pua izute ya, ka o we gọzie ya.
11 Samuel we si, Gini ka i meworo? Sọl we si, N'ihi na ahurum na ndi Israel esiwo n'ebe m'nọ b͕asa, ma gi onwe-gi abiaghi n'ubọchi akara àkà, ndi Filistia nāchikọta kwa onwe-ha na Mikmash;
12 m'we si, Ub͕u a ka ndi Filistia gāridakutem rue Gilgal, ma emeghm ka iru Jehova dajua; m'we jisie onwem ike, we sure àjà-nsure-ọku ahu.
13 Samuel we si Sọl, I mewo ihe-nzuzu: i debeghi ihe Jehova, bú Chineke-gi, nyere n'iwu, bú nke O nyere gi n'iwu: n'ihi na ub͕u a Jehova gēmewori ka ala-eze-gi guzosie ike n'ebe Israel nọ rue mb͕e ebighi-ebi.