23 Jehova we zọputa Israel n'ubọchi ahu: agha ahu we gabiga rue Bet-even.
24 Ma achiri ndikom Israel n'ihe-ike ubọchi ahu: Sọl we b͕a ndi Israel iyi, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri rue anyasi, ru kwa mb͕e m'bọsiri ọ́bọ̀ n'aru ndi-irom. Ndi Israel nile we ghara idetu nri ọnu.
25 Ndi ala ahu nile we ba n'oké ọhia; ma manu-aṅu di n'elu ọhia.
26 Ndi Israel we ba n'oké ọhia ahu, ma, le, manu-aṅu nērù erù: ma ọ dighi onye kwere ka aka-ya rue ọnu-ya; n'ihi na ndi Israel turu egwu ọb͕ub͕a-iyi ahu.
27 Ma Jonatan anughi mb͕e nna-ya b͕ara ndi Israel iyi: o we setipu ọnu-ọnu nkpa-n'aka nke di n'aka-ya, rutu ya nime ub͕ub͕ọ-manu-aṅu, weghachi aka-ya n'ọnu-ya; anya-ya we nwue enwu.
28 Otù nwoke n'etiti ndi Israel we za, si, Nna-gi b͕asiri ndi Israel iyi ike, si, Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nēri nri ta. Ndi Israel we nāda #mbà.
29 Jonatan we si, Nnam emekpawo ala-ayi aru: biko, lenu na anyam enwuwo enwu, n'ihi na edetuwom nwantī manu-aṅu nka ire.