11 Sọl we tua ube ahu; ọ si, M'gātugide Devid ọbuná na mb͕idi. Devid we chigharia onwe-ya si n'iru ya pua ub͕ò abua.
12 Sọl we nātu egwu Devid, n'ihi na Jehova nọyere ya, ma O siri n'ebe Sọl nọ wezuga Onwe-ya.
13 Sọl we si n'ebe ọ nọ wezuga ya, do ya ka ọ buru ya onye-isi nnù ndikom abua na ọgu iri; o we nāpu nābata kwa n'iru ndi Israel.
14 Devid we nēnwe uche n'uzọ-ya nile; Jehova nọye-kwa-ra ya.
15 Sọl we hu na nwoke ahu bu onye nēnwe uche nke-uku, o we tua ujọ ya.
16 Ma Israel nile na Juda nile nāhu Devid n'anya; n'ihi na ya onwe-ya nāpu nābata kwa n'iru ha.
17 Sọl we si Devid, Le, adam, bú Mirab, ya ka m'gēnye gi na nwunye: nání burum dìnkpà, bū kwa agha nile nke Jehova. N'ihi na Sọl siri, Ka akam ghara idi n'aru ya, kama ka aka ndi Filistia di n'aru ya.