1 Hana we kpe ekpere, si:Ọ nātọ obi m utọ n'ime Jehova,Mpim adiwo elu n'ime Jehova:Ọnum asawo mbara n'elu ndi-irom,N'ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi.
2 Ọ dighi onye di nsọ dika Jehova;N'ihi na ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Gi:Ọ dighi kwa oké nkume ọ bula dika Chineke-ayi.
3 Unu ekwula ọtutu okwu di elu elu;Ka oké okwu ghara isi n'ọnu-unu puta:N'ihi na Chineke nke ọmuma-ihe ka Jehova bu,Anēsite kwa n'aka-Ya atù omume.
4 Anyajiwo uta ndi-dike,Ma ndi nāsu ngọngọ ewerewo ike ke onwe-ha dika ihe-ọkiké.
5 Ndi afọ juru emewo onwe-ha ndi egoro ọlu n'ihi nri;Ma agu agubìwo ndi ọ nāgu:Ebe nwanyi àgà muworo umu asa;Ma nwanyi nke nwere ọtutu umu atawo aru.
6 Jehova nēme ka anwua, Ọ nēme kwa ka adi ndu:Ọ nēme ka arida rue ala-mọ, Ọ nēme kwa ka arigota.
7 Jehova nānapu madu ihe, nēme kwa ka ọ buru ọgaranya:Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu.