3 Unu ekwula ọtutu okwu di elu elu;Ka oké okwu ghara isi n'ọnu-unu puta:N'ihi na Chineke nke ọmuma-ihe ka Jehova bu,Anēsite kwa n'aka-Ya atù omume.
4 Anyajiwo uta ndi-dike,Ma ndi nāsu ngọngọ ewerewo ike ke onwe-ha dika ihe-ọkiké.
5 Ndi afọ juru emewo onwe-ha ndi egoro ọlu n'ihi nri;Ma agu agubìwo ndi ọ nāgu:Ebe nwanyi àgà muworo umu asa;Ma nwanyi nke nwere ọtutu umu atawo aru.
6 Jehova nēme ka anwua, Ọ nēme kwa ka adi ndu:Ọ nēme ka arida rue ala-mọ, Ọ nēme kwa ka arigota.
7 Jehova nānapu madu ihe, nēme kwa ka ọ buru ọgaranya:Ọ nēme ka adi ala, Ọ nēme kwa ka adi elu.
8 Ọ nēme ka onye nēnweghi ike si n'ájá bilie,Ọ nēsi n'ebe-ikpofu-ahihia welie ob͕eye elu,Ime ka ha na ndi-isi nọdu,Na ime ka ha keta oche-eze nsọpuru:N'ihi na Jehova nwe ogidi nile nke uwa,O dowo kwa elu-uwa dum madu bi n'elu ha.
9 Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe,Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri;N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike.