26 Ma Sọl ekwughi ihe ọ bula n'ubọchi ahu: n'ihi na ọ siri, Ihe-ndabà ka ọ bu; onye nādighi ọcha ka ọ bu; n'ezie ọ dighi ọcha.
27 O rue n'echi nke ọnwa ọhu, nke bu ubọchi nke-abua, na elere anya ọnọdu Devid nke tọb͕ọrọ n'efu: Sọl we si Jonatan nwa-ya, Gini mere nwa Jesi abataghi iri nri ma nyahuru ma ta?
28 Jonatan we za Sọl, si, Devid riọsirim ike ka m'rapu ya ka ọ je na Bet-lehem:
29 ọ si, Biko, zilagam; n'ihi na àjà ab͕uru-ayi ka ayi nwere n'obodo; ya onwe-ya enyewom iwu, bú nwa-nnem, ije: ma ub͕u a, ọ buru na ahutawom amara n'iru gi, biko, ka m'wepuga onwem, we hu umu-nnem. N'ihi ya ọ biaghi na table eze.
30 Iwe Sọl we di ọku megide Jonatan, ọ si ya, Gi nwa nke nwayi b͕agọrọ ab͕agọ nke nānupu kwa isi, àmaghm na gi onwe-gi nārọputa nwa Jesi ibu ihe-ihere-gi na ibu ihe-ihere ọtọ nne-gi?
31 N'ihi na ubọchi nile nwa Jesi di ndu n'elu ala, agaghi-eme ka gi onwe-gi ma-ọbu ala-eze-gi guzosie ike. Ma ub͕u a ziga kutaram ya, n'ihi na onye kwesiri ọnwu ka ọ bu.
32 Jonatan we za Sọl nna-ya, si ya, N'ìhi gini ka agēme ka ọ nwua? Gini ka o meworo?