30 Iwe Sọl we di ọku megide Jonatan, ọ si ya, Gi nwa nke nwayi b͕agọrọ ab͕agọ nke nānupu kwa isi, àmaghm na gi onwe-gi nārọputa nwa Jesi ibu ihe-ihere-gi na ibu ihe-ihere ọtọ nne-gi?
31 N'ihi na ubọchi nile nwa Jesi di ndu n'elu ala, agaghi-eme ka gi onwe-gi ma-ọbu ala-eze-gi guzosie ike. Ma ub͕u a ziga kutaram ya, n'ihi na onye kwesiri ọnwu ka ọ bu.
32 Jonatan we za Sọl nna-ya, si ya, N'ìhi gini ka agēme ka ọ nwua? Gini ka o meworo?
33 Sọl we tua ya ube-ya itub͕u ya: Jonatan we mara na nna-ya zubesiri ihe ahu ike, bú ime ka Devid nwua.
34 Jonatan we si na table bilie n'iwe di ọku, o righi kwa nri n'ubọchi nke-abua nke ọnwa ahu: n'ihi na o wutara ya n'ihi Devid, n'ihi na nna-ya mere ya ihe-ihere.
35 O rue, n'ututu, na Jonatan puru je n'ọhia na mb͕e ya na Devid kara àkà, otù nwatakiri-nwoke so kwa ya.
36 Ọ si nwa-okoro-ya, B͕a ọsọ, biko chọta àkú nile nke mu onwem nāb͕a. Mb͕e nwa-okoro ahu nāb͕a ọsọ, ya onwe-ya we b͕a àkú, me ka ọ gabiga ya.