9 Onye-nchu-àjà we si, Mma-agha Gọlaiat, bú onye Filistia, onye i tib͕uru na ndagwurugwu Ila, le, nke ahu di, afuchiworo ya n'ákwà n'azu ephod: ọ buru na i gēwere nke ahu, were ya: n'ihi na ọ dighi ọzọ di n'ebe a ma-ọbughi ya. Devid we si, Ọ dighi nke di ka ya; nyem ya.
10 Devid we bilie, b͕apu n'ubọchi ahu n'iru Sọl, bakuru Ekish, bú eze Gat.
11 Ndi-orù Ekish we si ya, Ọ̀ bughi Devid, bú eze ala ahu, bu nka? ọ̀ bughi ihe bayere nwoke a ka ha zaritara onwe-ha n'ite-egwú, si,Sọl etib͕uwo ndi-iro-ya, nnù ndikom abua na ọgu iri, nnù ndikom abua na ọgu iri,Devid kwa ndi-iro-ya, orú nnù ndikom na nnù ise, orú nnù ndikom na nnù ise?
12 Devid we tiye okwu ndia n'obi-ya, tua egwu Ekish, bú eze Gat, nke-uku.
13 O we b͕anwe omume-ya n'anya-ha, me onwe-ya dika onye anya-ya nādighi nma n'aka-ha, ọ ka kwa akàrà n'ibo ọnu-uzọ-ama, nāgusisi kwa ọnu-miri-ya n'afu-ọnu-ya.
14 Ekish we si ndi-orù-ya, Le, unu nāhu nwoke a ka o nēme onwe-ya dika onye nāwi ara: n'ìhi gini ka unu mere ka ọ biakutem?
15 Ndi nke akam nāwi ara, hà kọrọm ukọ, na unu emewo ka nwoke a bata ime onwe-ya dika onye nāwi ara n'irum? Nwoke a, ọ̀ gābata n'ulom?