24 Ha we bilie, jerue Zif n'iru Sọl: ma Devid na ndikom-ya di n'ọzara Maon, n'Araba, na Ndida nke ala ahu tọb͕ọrọ n'efu.
25 Sọl na ndikom-ya we je ichọ ya. Ha we gosi Devid: o we rida rue nkume ahu di elu, nọdu n'ọzara Maon. Sọl we nu ya, chua Devid n'azu n'ọzara Maon.
26 Sọl we je n'otù akuku ugwu, Devid na ndikom-ya n'akuku nke-ọzọ nke ugwu ahu: Devid we zọlie ọsọsọ ib͕apu n'iru Sọl; ma Sọl na ndikom-ya nāb͕a Devid na ndikom-ya buruburu inwude ha.
27 Ma onye-ozi biakutere Sọl, si, Me ngwa, lata; n'ihi na ndi Filistia amadewo imegide ala-ayi.
28 Sọl we si n'ichu Devid n'azu laghachi, je izute ndi Filistia: n'ihi ya ka ha kpọrọ ebe ahu Sela-hamahlekot.
29 Devid we si n'ebe ahu rigo, nọdu n'ebe ewusiri ike nke En-gedi.