18 Abigail we me ngwa, chiri ọgu ob͕e achicha iri, na karama-akpukpọ abua nke manya-vine juru nime ha, na aturu ise edoziri edozi, na mb͕é ọka aṅara aṅa ise, na ọgu uyọkọ nkpuru-vine amiri ami ise, na ọgu mbadamba fig iri, we bo ha inyinya-ibu.
19 Ọ we si umu-okorọbia-ya, Gabiganu n'irum; le, m'nābia n'azu unu. Ma o gosighi di-ya, bú Nebal.
20 O rue, mb͕e inyinya-ibu nēbu nwayi ahu ga, mb͕e ọ nārida kwa n'ebe-nzuzo nke ugwu ahu, le, Devid na ndikom-ya nārida izute ya; o we zute ha.
21 Ma Devid siri, Nání n'efu ka m'debeworo ihe nile nke nwoke a nwere n'ọzara, ọ dighi kwa ihe ọ bula elere anya ya na o furu efu n'ihe nile o nwere: o we nyeghachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe.
22 Chineke me ndi-iro Devid otú a, me kwa ha ihe ọzọ otú a, ọ buru na emem ka nwoke ọ bula fọdu rue ìhè ututu n'etiti ndi nile o nwere.
23 Abigail we hu Devid, me ngwa, si n'inyinya-ibu-ya rida, da kpue iru-ya n'ala n'iru Devid, kpọ isi ala.
24 O we da n'ala n'ukwu-ya, si, Onye-nwem, ka ajọ omume ahu dikwasi mu onwem: ma biko, ka orù-gi nwayi kwue na nti-gi, gi nuru kwa okwu nile nke orù-gi nwayi.