20 O rue, mb͕e inyinya-ibu nēbu nwayi ahu ga, mb͕e ọ nārida kwa n'ebe-nzuzo nke ugwu ahu, le, Devid na ndikom-ya nārida izute ya; o we zute ha.
21 Ma Devid siri, Nání n'efu ka m'debeworo ihe nile nke nwoke a nwere n'ọzara, ọ dighi kwa ihe ọ bula elere anya ya na o furu efu n'ihe nile o nwere: o we nyeghachim ihe ọjọ n'ọnọdu ezi ihe.
22 Chineke me ndi-iro Devid otú a, me kwa ha ihe ọzọ otú a, ọ buru na emem ka nwoke ọ bula fọdu rue ìhè ututu n'etiti ndi nile o nwere.
23 Abigail we hu Devid, me ngwa, si n'inyinya-ibu-ya rida, da kpue iru-ya n'ala n'iru Devid, kpọ isi ala.
24 O we da n'ala n'ukwu-ya, si, Onye-nwem, ka ajọ omume ahu dikwasi mu onwem: ma biko, ka orù-gi nwayi kwue na nti-gi, gi nuru kwa okwu nile nke orù-gi nwayi.
25 Biko, ka onye-nwem ghara itukwasi obi-ya n'aru nwoke a jọb͕uru onwe-ya, bú Nebal: n'ihi na dika aha-ya si di, otú a ka ya onwe-ya di; Nebal bu aha-ya, ihe-nzuzu di kwa n'aka-ya: ma mu onwem, bú orù-gi nwayi, ahughm umu-okorọbia onye-nwem, ndi i zitere.
26 Ma ub͕u a, onye-nwem, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, ebe Jehova b͕ochiworo gi ka i ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka aka-gi ghara kwa izọputa gi, ub͕u a kwa ka ndi-iro-gi na ndi nāchọ ime onye-nwem ihe ọjọ di ka Nebal.