25 Biko, ka onye-nwem ghara itukwasi obi-ya n'aru nwoke a jọb͕uru onwe-ya, bú Nebal: n'ihi na dika aha-ya si di, otú a ka ya onwe-ya di; Nebal bu aha-ya, ihe-nzuzu di kwa n'aka-ya: ma mu onwem, bú orù-gi nwayi, ahughm umu-okorọbia onye-nwem, ndi i zitere.
26 Ma ub͕u a, onye-nwem, Jehova nādi ndu, nkpuru-obi-gi nādi kwa ndu, ebe Jehova b͕ochiworo gi ka i ghara ibà n'ikpe-ọmuma ọbara, ka aka-gi ghara kwa izọputa gi, ub͕u a kwa ka ndi-iro-gi na ndi nāchọ ime onye-nwem ihe ọjọ di ka Nebal.
27 Ma ub͕u a ngọzi a nke nwayi nējere gi ozi wetaworo onye-nwem, ka enye ya umu-okorọbia ndi nēso onye-nwem n'ukwu n'ukwu jeghari.
28 Biko, b͕aghara njehie orù-gi nwayi: n'ihi na Jehova aghaghi imere onye-nwem ulo kwesiri ntukwasi-obi, n'ihi na ọ bu agha nile nke Jehova ka onye-nwem nēbu; agaghi-ahuta kwa ihe ọjọ n'aru gi ubọchi-gi nile.
29 Ọ bu kwa ezie na madu biliri ichu gi, na ichọ nkpuru-obi-gi: ma agēke nkpuru-obi onye-nwem na ngugu nke ndi di ndu n'aka Jehova, bú Chineke-gi; ma nkpuru-obi ndi-iro-gi, ha ka Ọ gēsi n'etiti oghere èbè-Ya mapu.
30 O gēru kwa, mb͕e Jehova gēmewori nye onye-nwem dika ezi ihe nile si di nke O kwuworo bayere gi, mb͕e Ọ gēnyewo kwa gi-ri iwu ibu onye-ndú Israel;
31 na nka agaghi-aburu gi ihe-nṅaghari, ọ gaghi-aburu kwa onye-nwem ihe-isu-ngọngọ obi, na i wusiwo ọbara n'efu, ma-ọbu na onye-nwem azọputawo onwe-ya: ma mb͕e Jehova gēmewori onye-nwem nma, i gēcheta kwa orù-gi nwayi.