2 Ndi Filistia we do onwe-ha n'usoro izute Israel: agha ahu we nọsa, ewe tib͕ue Israel n'iru ndi Filistia: ha we tib͕ue n'etiti usoro ndi-agha Israel n'ọhia ihe ra ka nnù ndikom iri.
3 Ndi Israel we ba n'ọmuma-ulo-ikwū, ndi-okenye Israel we si, N'ìhi gini ka Jehova tib͕uworo ayi ta n'iru ndi Filistia? Ka ayi si na Shailo wetara onwe-ayi ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova, ka o we bata n'etiti ayi, zọputa ayi n'ọbu-aka ndi-iro-ayi.
4 Ndi Israel we ziga na Shailo, ha we si n'ebe ahu bute ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Onye bi n'etiti cherubim: umu-ndikom Ilai abua, bú Họfnai na Finehas, nọye-kwa-ra ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Chineke n'ebe ahu.
5 O rue, mb͕e ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova batara n'ọmuma-ulo-ikwū, na Israel nile tiri oké nkpu, ala wee daa uda.
6 Ndi Filistia we nu olu iti-nkpu ahu, we si, Gini bu olu oké iti-nkpu a n'ọmuma-ulo-ikwū ndi-Hibru? Ha we mara na ib͕e Jehova abàwo n'ọmuma-ulo-ikwū.
7 Ndi Filistia we tua egwu, n'ihi na ha siri, Chineke abàwo n'ọmuma-ulo-ikwū ahu. Ha we si, Ahuhu nādiri ayi! n'ihi na ihe dika nka adighi na mb͕e gara aga.
8 Ahuhu nādiri ayi! ònye gānaputa ayi n'aka chi ndia di ike nke-ukwu? ndia bu chi nke were ihe-otiti nile ọ bula tib͕ue ndi Ijipt n'ọzara.