12 enyewo gi amam-ihe na ihe-ọmuma; M'gēnye kwa gi àkù, na ihe-nkpakọta, na nsọpuru, nke ndi-eze ndi buru gi uzọ nēnweghi otú a, ọ dighi kwa onye nke gēso gi gēnwe otú a.
13 Solomon we si n'ije ọ jeruru ebe di elu nke di na Gibeon, si n'iru ulo-ikwū nzute, biarue Jerusalem; o we buru eze Israel.
14 Solomon we chikọta ub͕ọ-ala na ndi-inyinya: o we nwe nnù ub͕ọ-ala atọ na ọgu iri, na orú nnù ndi-inyinya na nnù iri, o we do ha n'obodo ub͕ọ-ala, na n'ebe eze nọ na Jerusalem.
15 Eze we me ọla-ọcha na ọla-edo ka ọ di ka nkume na Jerusalem, o me-kwa-ra osisi cedar ka ha di ka osisi sycomore nke di n'ebe di ala ala n'uba.
16 Anēme kwa ka inyinya Solomon nwere si n'Ijipt puta; n'usu ka ndi-ahia eze nānara ha, otù usu n'ọnu-ahia-ya.
17 Ha we me ka otù ub͕ọ-ala rigota si n'Ijipt puta na nnù shekel ọla-ọcha na ọgu iri, na otù inyinya n'ọgu shekel asa na iri: otú a ka ha nēweputara eze nile nke ndi Het, na ndi-eze Siria, site n'aka-ha.