2. Ihe Emere 12 IGBOB

1 O rue, mb͕e emere ka ala-eze Rehoboam guzosie ike, mb͕e ọ di kwa ike, na ọ rapuru iwu Jehova, ya na Israel nile.

2 O rue n'arọ nke-ise nke eze, bú Rehoboam, na Shaishak, bú eze Ijipt, rigotara imegide Jerusalem, (ọ bu n'ihi na ha mekpuru emekpu megide Jehova,)

3 ya na nnù ub͕ọ-ala atọ na orú nnù ndi-inyinya uzọ asa na nnù iri: ndi soro ya si n'Ijipt bia enweghi kwa ọnu-ọgugu; bú ndi-Lubim, na ndi-Sukim, na ndi Etiopia.

4 O we were obodo nile ewusiri ike nke Juda nwere, we biarue Jerusalem.

5 Ma Shemaia, bú onye-amuma, biakutere Rehoboam na ndi-isi Juda, ndi achikọtara rue Jerusalem n'ihi Shaishak, ọ si ha, Otú a ka Jehova siri, Unu onwe-unu arapuwom, ọzọ kwa, Mu onwem arapuwo unu n'aka Shaishak.

6 Ndi-isi Israel na eze we weda onwe-ha n'ala, si, Onye ezi omume ka Jehova bu.

7 Ma mb͕e Jehova huru na ha wedara onwe-ha n'ala, okwu Jehova ruru Shemaia nti, si, Ha ewedawo onwe-ha n'ala; M'gaghi-ebibi ha: kama M'gēnye ha nb͕apu na mb͕e ntà, agaghi-awusi kwa ọnumam na Jerusalem site n'aka Shaishak.

8 Otú ọ di, ha gāburu ya orù; ka ha we mara òfùfèm, na òfùfè ala-eze nke ala ọzọ.

9 Shaishak, bú eze Ijipt, we rigota imegide Jerusalem, we wepu àkù nile nke ulo Jehova na àkù nile nke ulo eze; ha nile ka o wepuru: o wepu-kwa-ra ọta ọla-edo nile nke Solomon mere.

10 Eze, bú Rehoboam, we me ọta ọla n'ọnọdu ha, nye ha n'aka ndi-isi ndi-ọb͕a-ọsọ, bú ndi nēche ọnu-uzọ ulo eze, ka ha lekọta ha anya.

11 O rue, mb͕e ọ bula eze nābà n'ulo Jehova, na ndi-ọb͕a-ọsọ biara we būru ha, bughachi kwa ha n'ime-ulo ndi-ọb͕a-ọsọ.

12 Ma mb͕e o wedara onwe-ya n'ala, iwe Jehova siri n'aru ya chigharia, O we ghara ibibizu ya: ọzọ kwa, ezi ihe ufọdu di na Juda.

13 Eze, bú Rehoboam, we me onwe-ya ka ọ di ike na Jerusalem, o we buru eze: n'ihi na Rehoboam b͕ara ọgu arọ abua na otù mb͕e ọ malitere ibu eze, o we buru eze arọ iri-na-asa na Jerusalem, bú obodo ahu nke Jehova rọputara n'ebo nile nke Israel, ido aha-Ya n'ebe ahu: aha nne-ya bu Neama nwayi Amon.

14 O we me ihe ọjọ, n'ihi na o dozighi obi-ya ichọ Jehova.

15 Ma ihe nile Rehoboam mere, nke-mbu na nke-ikpe-azu, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ihe emere nke Shemaia, bú onye-amuma, na n'akwukwọ Ido, bú onye-ọhu-uzọ, bayere akwukwọ-osuso-ọmumu? Ma agha di n'etiti Rehoboam na Jeroboam ubọchi nile.

16 Rehoboam we so nna-ya-hà dina n'ọnwu, elìe ya n'obodo Devid: Abaija nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36