1 Rehoboam we jerue Shekem: n'ihi na Shekem ka Israel nile biaruru ime ya eze.
2 O rue, mb͕e Jeroboam nwa Nebat nuru ya, (ma onye ahu nọ n'Ijipt, ebe o siri n'iru Solomon, bú eze, b͕alaga,) na Jeroboam siri n'Ijipt lata.
3 Ha we ziga, kpọ ya; Jeroboam na Israel nile we bia, gwa Rehoboam okwu, si,
4 Nna-gi mere yoke-ayi ka o sie ike: ma ub͕u a me ka ọ di nfe kari, bú òfùfè siri ike nke nna-gi, na yoke-ya di arọ́ nke ọ tukwasiri ayi, ayi gēfè kwa gi òfùfè.
5 Ọ si ha, Mb͕e ubọchi atọ gasiri unu laghachikutekwam. Ndi Israel we la.