3 Ha we ziga, kpọ ya; Jeroboam na Israel nile we bia, gwa Rehoboam okwu, si,
4 Nna-gi mere yoke-ayi ka o sie ike: ma ub͕u a me ka ọ di nfe kari, bú òfùfè siri ike nke nna-gi, na yoke-ya di arọ́ nke ọ tukwasiri ayi, ayi gēfè kwa gi òfùfè.
5 Ọ si ha, Mb͕e ubọchi atọ gasiri unu laghachikutekwam. Ndi Israel we la.
6 Eze, bú Rehoboam, we me ka ndi-okenye dua ya ọdu, bú ndi nēguzo n'iru Solomon nna-ya mb͕e ọ nọ na ndu, si, Ùnu onwe-unu si aṅa nādu ọdu iweghachiri ndi nka okwu?
7 Ha we gwa ya okwu, si, Ọ buru na i ghọrọ ndi nka onye ọma, ihe-ha we tọ gi utọ, i we gwa ha okwu di nma, ha gāghọ-kwa-ra gi orù ubọchi nile.
8 Ma ọ rapuru idu-ọdu nke ndi-okenye, nke ha nādu ya, o me ka umu-okorọbia dua ya ọdu, bú ndi ya na ha tokọzuru okè, ndi nēguzo n'iru ya.
9 Ọ si ha, Gini ka unu onwe-unu nādu ọdu, ka ayi we weghachiri ndi nka okwu, bú ndi gwaworom okwu, si, Me ka ọ di nfe kari, bú yoke nke nna-gi tukwasiri ayi?