1 Rehoboam we biarue Jerusalem, kpọkọta ulo Juda na Benjamin, orú nnù ndikom orú uzọ na abua na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nēbu agha, ibuso Israel agha, iweghachiri Rehoboam ala-eze:
2 Okwu Jehova we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si,
3 Gwa Rehoboam nwa Solomon, bú eze Juda, gwa kwa Israel nile di na Juda na Benjamin, okwu, si,
4 Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu agha: laghachinu, nwoke ọ bula n'ulo-ya; n'ihi na n'ebe M'nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, si n'ije imegide Jeroboam laghachi.
5 Rehoboam we biri na Jerusalem, wue obodo ufọdu ib͕ochi agha nime Juda.
6 O wue Bet-lehem, na Itam, na Tekoa,
7 na Bet-zua, na Soko, na Adulam,