10 na Zora, na Ajalon, na Hebron, nke di na Juda na Benjamin, bú obodo ewusiri ike.
11 Ọ we me ka ebe nile ewusiri ike di ike, tiye ndi-ndú nime ha, na àkù, bú ihe-oriri, na manu, na manya-vine.
12 O tiye-kwa-ra ọta na ube n'obodo nile ọ bula, we me ka ha di ike ri nne. O we nwe Juda na Benjamin.
13 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi nọ n'Israel nile we si n'ókè-ala-ha nile guzo onwe-ha n'akuku ya.
14 N'ihi na ndi Livai rapuru ebe-ita-nri-anu nile ha na ihe-onwunwe-ha, we jerue Juda, jeru kwa Jerusalem: n'ihi na Jeroboam na umu-ya ndikom juru ha, ka ha ghara iburu Jehova ndi-nchu-àjà:
15 ọ we guzoro onwe-ya ndi-nchu-àjà idiri ebe di elu, na idiri nkpi, na idiri umu-ehi, nke o mere.
16 Site n'ebo nile nke Israel ndi nēnye obi-ha ichọ Jehova, bú Chineke Israel, so-kwa-ra ha bia na Jerusalem ichuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, àjà.