2 Okwu Jehova we rue Shemaia nti, bú onye nke Chineke, si,
3 Gwa Rehoboam nwa Solomon, bú eze Juda, gwa kwa Israel nile di na Juda na Benjamin, okwu, si,
4 Otú a ka Jehova siri, Unu arigola, unu ebuso-kwa-la umu-nne-unu agha: laghachinu, nwoke ọ bula n'ulo-ya; n'ihi na n'ebe M'nọ ka ihe a siteworo. Ha we nu okwu Jehova, si n'ije imegide Jeroboam laghachi.
5 Rehoboam we biri na Jerusalem, wue obodo ufọdu ib͕ochi agha nime Juda.
6 O wue Bet-lehem, na Itam, na Tekoa,
7 na Bet-zua, na Soko, na Adulam,
8 na Gat, na Marisha, na Zif,