2 O we tiye usu-ndi-agha n'obodo nile ewusiri ike nke Juda, o tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n'ala Juda, na n'obodo Efraim nile nke Esa nna-ya were.
3 Jehova we nọyere Jehoshafat, n'ihi na o jere ije n'uzọ mbu Devid, bú nna-ya, ọ chọghi kwa Bealim;
4 kama ọ chọrọ Chineke nke nna-ya, jeghari kwa n'ihe nile O nyere n'iwu, ọ bughi kwa dika omume Israel si di.
5 Jehova we me ka ala-eze guzosie ike n'aka-ya; Juda nile we nye Jehoshafat onyinye-inata-iru-ọma; o we nwe àkù na nsọpuru n'uba.
6 Obi-ya di kwa elu n'uzọ nile nke Jehova: ọzọ kwa, o siri na Juda wezuga ebe nile di elu na Asherim.
7 Ma n'arọ nke-atọ nke ọ bu eze o zigara ndi-isi-ya, bú Ben-hail, na Obadaia, na Zekaraia, na Netanel, na Maikaia, izí ihe n'obodo Juda nile:
8 ha na ndi Livai, bú Shemaia, na Netanaia, na Zebadaia, na Asahel, na Shemiramot, na Jehonatan, na Adonaija, na Tobaija, na Tob-Adonaija, ndi Livai; ha na Elishama na Jehoram, bú ndi-nchu-àjà.