2. Ihe Emere 2:6-12 IGBOB

6 Ma ònye nwere ike iwuru Ya ulo, n'ihi na elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe nāgaghi-anagide Ya? ònye kwa ka mu onwem bu, na m'gēwuru Ya ulo, ma-ọbughi nání isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Ya?

7 Ma ub͕u a ziterem otù nwoke mara ihe n'ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla, na n'ígwè, na n'ogho ododo na ogho uhie na ogho anunu, onye ma-kwa-ra iso ndi mara ihe, ndi nọ n'ebe m'nọ na Juda na nime Jerusalem, bú ndi Devid nnam doziri, b͕u eb͕ub͕u.

8 Si kwa na Lebanon ziterem osisi cedar, na osisi fir, na osisi algum: n'ihi na mu onwem amawo na ndi-orù-gi mara ib͕utu osisi nime Lebanon; ma, le, ndi-orùm gēso kwa ndi-orù-gi,

9 ọbuná idozirim osisi n'uba: n'ihi na ulo ahu nke mu onwem nēwu gādi uku di kwa ebube.

10 Ma, le, m'gēnye ndi-orù-gi, bú ndi nāwa ihe-ọwuwa ndi nēb͕utu osisi, orú nnù ọtùtù cor uzọ abua na nnù iri nke ọka wheat asuru asu, na orú nnù ọtùtù cor uzọ abua na nnù iri nke ọka barley, na orú nnù ọtùtù bath uzọ abua na nnù iri nke manya-vine, na orú nnù ọtùtù bath uzọ abua na nnù iri nke manu.

11 Huram, bú eze Taia, we were odide-akwukwọ, nke o zitere Solomon, si, N'ihi na Jehova huru ndi-Ya n'anya, n'ihi ya ka O mere gi eze-ha.

12 Huram we si, Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke Israel, bu, Onye mere elu-igwe na uwa, Onye nyeworo Devid, bú eze, nwa-nwoke nke mara ihe, onye mara ezi uche na nghọta, onye gēwuru Jehova ulo, wu-kwa-ra ala-eze-ya ulo.