1 O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na umu Moab, na umu Amon, ha na ufọdu site na ndi ọzọ, biara imegide Jehoshafat n'agha.
2 Madu ufọdu we bia gosi Jehoshafat, si, Ìgwè madu bara uba esiwo n'ofè oké osimiri, site na Siria, bia imegide gi; ma, le, ha nọ nime Hazazon-tema (nke bu En-gedi).
3 Jehoshafat we tua egwu, che iru-ya ichọ Jehova; o we kpọsa obubu-ọnu na Juda nile.
4 Juda we chikọta onwe-ha ichọ iye-aka site n'aka Jehova: ọbuná site n'obodo nile nke Juda ka ha biara ichọsi Jehova ike.