9 Ọ buru na ihe ọjọ abiakwasi ayi, bú mma-agha ikpé, ma-ọbu ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu oké unwu, ayi gēguzo n'iru ulo a, na n'iru Gi, (n'ihi na aha-Gi di n'ulo a,) si na nkpab͕u-ayi tikue Gi, I gānu kwa, zọputa.
10 Ma ub͕u a, le, umu Amon na Moab na ugwu Sia, ndi I nēkweghi Israel ka ha bakuru ha, mb͕e ha nēsi n'ala Ijipt bia, kama ha si n'ebe ha nọ wezuga onwe-ha, ha ekpochapughi kwa ha;
11 ma, le, otú ndi ahu nēnyeghachi ayi, n'ibia ichupu ayi n'ihe-nnweta-Gi, nke I meworo ka ayi nweta.
12 Chineke-ayi, Ì gaghi-ekpe ha ikpe? n'ihi na ike adighi nime ayi n'iru ìgwè madu a bara uba nke nābia imegide ayi; ayi onwe-ayi amaghi kwa ihe ayi gēme: kama ọ bu Gi ka anya-ayi nādikwasi.
13 Juda nile nēguzo kwa n'iru Jehova, ha na umu-ntakiri-ha, na ndinyom-ha, na umu-ha.
14 Ma Mọ Jehova dikwasiri Jahaziel nwa Zekaraia, nwa Benaia, nwa Jeiel, nwa Matanaia, bú onye Livai, onye sitere n'umu Esaf, n'etiti nkpọkọta ahu;
15 ọ si, Ṅanu nti, Juda nile, na ndi bi na Jerualem, na eze-ayi, bú Jehoshafat, otú a ka Jehova siri unu, Unu onwe-unu atula egwu, unu atu-kwa-la ujọ n'iru ìgwè madu a bara uba; n'ihi na ọ bughi unu nwe agha nka, kama ọ bu Chineke nwe.