2 Ọgu arọ abua na abua ka Ehazaia b͕ara mb͕e ọ malitere ibu eze; o we buru eze otù arọ na Jerusalem: ma aha nne-ya bu Atalaia nwa Ọmri.
3 Ya onwe-ya je-kwa-ra ije n'uzọ nile nke ulo Ehab: n'ihi na nne-ya bu onye nādu ya ọdu imebi iwu.
4 O we me ihe jọrọ njọ n'anya Jehova, dika ulo Ehab mere: n'ihi na ndi ahu buru ya ndi nādu ọdu mb͕e ọnwu nna-ya gasiri, iwetara ya nbibi.
5 O jeghari-kwa-ra n'idu-ọdu-ha, we soro Jehoram nwa Ehab, bú eze Israel, ibuso Hazael, bú eze Siria, agha na Remot-gilead: ndi Siria we tib͕ue Joram.
6 O we lata ka agwọ ya nime Jezreel n'ihi ntib͕u nke ha tib͕uru ya na Rema, mb͕e o nēbuso Hazael, bú eze Siria, agha. Azaraia nwa Jehoram, bú eze Juda, we rida ihu Jehoram nwa Ehab nime Jezreel, n'ihi na ọ nāria ọria.
7 Ma o sitere na Chineke, bú nzọda Ehazaia, n'ibiakute Joram: n'ihi na mb͕e ọ biara, o we so Jehoram pukuru Jihu nwa Nimshi, onye Jehova tere manu ibipu ulo Ehab.
8 O rue, mb͕e Jihu nēme ulo Ehab ihe ekpere n'ikpe, na ọ huru ndi-isi Juda, na umu-ndikom nke umu-nne Ehazaia, ndi nējere Ehazaia ozi, o we b͕ue ha.