18 Ha we rapu ulo Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha, we fè Asherim na arusi òfùfè: iwe we dikwasi Juda na Jerusalem n'ikpe-ọmuma-ha nka.
19 O zite ndi-amuma n'etiti ha, ime ka ha laghachikute Jehova; ha we b͕a àmà megide ha: ma ha aṅaghi nti.
20 Mọ Chineke we were Zekaraia nwa Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we guzo n'elu n'ebe ndi Juda nọ, si ha, Otù a ka Chineke siri; N'ihi gini ka unu onwe-unu nāgabiga ihe nile Jehova nyere n'iwu, ihe we ghara igara unu nke-ọma? n'ihi na unu arapuwo Jehova, Ọ rapuwo kwa unu.
21 Ha we kekọta onwe-ha imegide ya, were nkume tub͕ue ya, n'ihi ihe eze nyere n'iwu, n'ogige ulo Jehova.
22 Joash, bú eze, echetaghi kwa ebere nke Jehoiada, bú nna-ya, mere ya, o we b͕ue nwa-ya. Ma mb͕e ọ nwuru, ọ si, Ka Jehova hu ya, ju ase.
23 O rue, n'ọb͕ub͕a arọ, na usu-ndi-agha Siria rigoro imegide ya: ha we biarue Juda na Jerusalem, bilie ndi-isi nile nke ndi Juda site n'etiti ndi ahu, ha we zigara eze Damaskọs ihe-nkwata-ha nile.
24 N'ihi na usu-ndi-agha Siria chiri ndikom ole-na-ole bia; Jehova we nye usu-ndi-agha bara uba nke-uku n'aka-ha, n'ihi na ha rapuru Jehova, bú Chineke nke ndi bu nna-ha. Ha we me Joash ihe nile ekpere n'ikpe.