22 Ewe tib͕ue Juda n'iru Israel; ha we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ulo-ikwū-ya.
23 Joash, bú eze Israel, we Jide Amazaia, bu eze Juda, nwa Joash nwa Jehoahaz, nime Bet-shemesh, me ka ọ biarue Jerusalem, we tipue mb͕idi Jerusalem site n'ọnu-uzọ-ama Efraim rue ọnu-uzọ-ama nke nkuku, nnù cubit.
24 Ọ chiri ọla-edo na ọla-ọcha nile, na ihe nile ahutara n'ulo Chineke n'aka Obed-edom, na àkù nile nke ulo eze, na ndi edoro na mbe, o we laghachi na Sameria.
25 Amazaia nwa Joash, bú eze Juda, we di ndu mb͕e ọnwu Joash nwa Jehoahaz, bú eze Israel, gasiri, arọ iri na ise.
26 Ma ihe nile nke Amazaia mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, le, èdeghi ihe ahu n'akwukwọ ndi-eze Juda na Israel?
27 Ma site na mb͕e Amazaia siri n'iso Jehova wezuga onwe-ya ha kekọtara nkekọta-madu imegide ya nime Jerusalem; o we b͕alaga na Lekish: ha we ziga ichuso ya rue Lekish, me ka ọ nwua n'ebe ahu.
28 Ha we bute ya n'elu inyinya, lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'obodo Juda.