2. Ihe Emere 25:4-10 IGBOB

4 Ma o meghi ka umu-ha nwua, kama o mere dika ihe edeworo n'iwu n'akwukwọ Moses, nke Jehova nyere n'iwu, si, Ndi bu nna agaghi-anwu n'ọnọdu umu-ha, umu agaghi-anwu kwa n'ọnọdu ndi bu nna-ha; kama onye ọ bula gānwu nime nmehie nke aka ya.

5 Amazaia we chikọta Juda, guzo ha dika ulo nke ndi bu nna-ha si di, nye ndi-isi usu nnù ndikom abua na ọgu iri, nye kwa ndi-isi usu ọgu ndikom ise, bú Juda na Benjamin nile: o we gukọta ha, site n'onye b͕ara orú arọ we gaba n'iru, o we hu na ha di orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ iri-na-asa na nnù iri, bú ndi arọputara arọputa, ndi nāpukuru usu-ndi-agha, ndi nēji ube na ọta.

6 O we were ọgu talent ọla-ọcha ise go orú nnù ndikom uzọ iri-na-abua na nnù iri, ha bu ndi-dike bu dìnkpà, site n'Israel.

7 Ma onye nke Chineke biakutere ya, si, Eze, ka usu-ndi-agha Israel ghara iso gi bia; n'ihi na Jehova anọyeghi Israel, bú umu nile nke Efraim.

8 Otú ọ di, gi onwe-gi bia, me ihe, di ike ibu agha: Chineke gēme ka i ghara iso ngọngọ n'iru onye-iro-gi; n'ihi na ike di nime Chineke iye aka na ime ka asu ngọngọ.

9 Amazaia we si onye nke Chineke ahu, Ma gini ka ayi gēme bayere ọgu talent ise ahu nke m'nyeworo usu ndi nāpunara madu ihe nke Israel? Onye nke Chineke we si, Jehova nwere ihe inye gi nke bara uba kari.

10 Amazaia we kewapu ha, bú usu ndi nāpunara madu ihe nke siri n'Efraim biakute ya, ka ha laghachi n'ebe-ha: iwe-ha we di ọku nke-uku megide Juda, ha we laghachi n'ebe-ha n'iwe di ọku.