2. Ihe Emere 26:17-23 IGBOB

17 Azaraia, bú onye-nchu-àjà, we baso ya, ya na ọgu ndi-nchu-àjà anọ nke Jehova, bú ndi-dìnkpà:

18 ha we guzo imegide Uzaia, bú eze, si ya, Uzaia, ọ bughi gi nwe isurere Jehova ihe-nsure-ọku nēsì utọ, kama ọ bu ndi-nchu-àjà, bú umu Eron, ndi edoworo nsọ isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ: pua n'ebe nsọ a; n'ihi na i mekpuwo emekpu; ọ gaghi-adi-kwa-ra gi ihe nsọpuru site n'aka Jehova, bú Chineke.

19 Uzaia we wee iwe; ma ihe eji esure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ di n'aka-ya isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ; ma mb͕e o nēkosa ndi-nchu-àjà ọnuma, ekpenta wara n'egedege-iru-ya, n'iru ndi-nchu-àjà n'ulo Jehova, n'akuku ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.

20 Azaraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na ndi-nchu-àjà nile, we le ya anya, ma, le, ya onwe-ya bu onye-ekpenta n'egedege-iru-ya, ha we me ka ọ pua n'ebe ahu n'ima-jijiji;ọzọ kwa, ya onwe-ya mere ngwa ipu apu, n'ihi na Jehova etib͕uwo ya.

21 Uzaia, bú eze, we buru onye-ekpenta rue ubọchi ọnwu-ya, we biri n'ulo ewupuru iche, ebe ọ bu onye-ekpenta; n'ihi na ebipuru ya n'ulo Jehova: Jotam nwa-ya we buru onye-isi ulo eze, nēkpe ndi ala ahu ikpe.

22 Ma ihe nile nke Uzaia mere nke fọduru, nke-mbu na nke-ikpe-azu, Aisaia nwa Emoz, bú onye-amuma, dere ha n'akwukwọ.

23 Uzaia we so nna-ya-hà dina n'ọnwu; ha we lìe ya n'ebe elìri nna-ya-hà n'ọhia olìlì nke ndi-eze nwere; n'ihi na ha siri, Onye-ekpenta ka ọ bu: Jotam nwa-ya we buru eze n'ọnọdu ya.