14 na Jehuel na Shimai, ndi sitere n'umu Himan: na Shemaia na Uziel, ndi sitere n'umu Jedutum.
15 Ha we chikọta umu-nne-ha ndikom, do onwe-ha nsọ, ba, dika ihe ahu si di nke eze nyere n'iwu, site n'okwu, ime ka ulo Jehova di ọcha.
16 Ndi-nchu-àjà we ba n'ime-ime nke ulo Jehova, ime ka o di ọcha, ha we buputa ihe ruru árú nile nke ha chọtara n'ulo uku Jehova tiye ya n'ogige ulo Jehova. Ndi Livai we nara ya, ibupu ya je miri-iyi Kidron n'èzí.
17 Ha we malite ido nsọ n'ubọchi mbu nke ọnwa mbu, n'ubọchi nke-asatọ nke ọnwa ka ha biaruru uzọ-nbata Jehova; ha we do ulo Jehova nsọ n'ubọchi asatọ: ọ bu kwa n'ubọchi nke-iri-na-isi nke ọnwa mbu ka ha dobìri ya nsọ.
18 Ha we ba nime biakute Hezekaia, bú eze, si, Ayi emewo ka ulo Jehova nile di ọcha, ya na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, na ihe-ya nile, na Table achicha anēdo n'usoro, na ihe-ya nile.
19 Ihe nile kwa nke eze, bú Ehaz, juru aju mb͕e ọ bu eze mb͕e o mekpuru emekpu, ndia ka ayi doziworo, do kwa nsọ; ma, le, ha di n'iru ebe-ichu-àjà Jehova.
20 Hezekaia, bú eze, we bilie n'isi-ututu, chikọta ndi-isi obodo, rigorue ulo Jehova.